Anom n’oru ma jide mma, Emetukwalam aka n’oge a! Ma oburu na mgaa n’ulo oriri. Agaghim eji ihe ha ekwu wee kporo ihe, Ihe obula mrutara mga anufu ya na mmanya, Otua ka m ga n’eme oge obula, ndi enyim. Otu nwoke biakwuterem wee si, "Ndu adighi mfe n’ubochi ndia - Ndi nzuzu di ka gi kwesiri ino n’ulo mkporo." Mu na nnunnu ojoo anaghi ekwukorita, Ma agwaghikwam ya okwu obula, Otua ka m ga n’eme oge obula, ndi enyim. Oburu na ichoro ima ihe m na eche - Odi mma, enyi, k’anyi nuo mmanya, Anyi ga edozi nsogbu obula anyi nwere. Mana oburu na ina eso uzo onye ojoo - Out iwu ahu diiri anyi niile, Otua ka oga adiri onye obula mgbe niile.
© Echezonachukwu Nduka. Sụgharịrị, 2015